1 Ihe E Mere 29:1
1 Chronicles 29:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke.
1 Chronicles 29:1 in English
1 Chronicles 29:1 · Berean Standard Bible
Then King David said to the whole assembly, “My son Solomon, the one whom God has chosen, is young and inexperienced. The task is great because this palace is not for man, but for the LORD God.
Context
1Mgbe ahụ, Devid gwara ọgbakọ Izrel niile okwu sị ha, “Nwa m Solomọn, onye Chineke họpụtara ịbụ eze nʼọnọdụ m, bụ nwantakịrị na-amachabeghị ihe. Ma ọrụ o nwere ịrụ dị ukwuu, nʼihi na ụlọ ukwu a abụghị mmadụ ka ọ dịrị, kama ọ bụ nye Onyenwe anyị Chineke. 2Ma nʼike m niile, agbalịala m wetachaa ihe niile a ga-eji wuo ụlọnsọ ukwu Chineke m ebe ha dị ukwuu: ọlaedo a ga-eji kpụọ ihe ọlaedo niile, ọlaọcha a ga-eji kpụọ ihe ọlaọcha niile, bronz a ga-eji kpụọ ihe bronz niile, igwe a ga-eji kpụọ ihe igwe niile, na osisi a ga-eji rụọ ihe osisi niile, nkume dị oke ọnụahịa ọniks, a ga-ahịọnye ahịọnye, na nkume dị oke ọnụahịa tọkwọisi, na nkume ndị ọzọ ụcha ha dị iche iche, na nkume ndị ọzọ mara mma, tinyere mabụl. 3Ugbu a, nʼihi mmasị m nʼebe ụlọnsọ Chineke m dị, ana m enye akụ nke aka m niile, ya bụ ọlaedo na ọlaọcha m, iji ya nye aka, maka iwu ụlọnsọ ukwu Chineke m. Ihe ndị a ka m na-enye, tụkwasịkwa nʼelu ihe ndị ọzọ niile bụ nke m nyerela, nʼihi ụlọnsọ ukwu a:
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.