1 Ihe E Mere 28:20
1 Chronicles 28:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị.
1 Chronicles 28:20 in English
1 Chronicles 28:20 · Berean Standard Bible
David also said to Solomon his son, “Be strong and courageous, and do it. Do not be afraid or discouraged, for the LORD God, my God, is with you. He will neither fail you nor forsake you before all the work for the service of the house of the LORD is finished.
Context
18Nʼikpeazụ, o wepụtara ọlaedo a nụchara anụcha a ga-eji kpụọ ebe ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. O nyere ya ihe osise gosiri otu a ga-esi wuo ụgbọ agha, ya bụ, mmụọ ozi cherubim ndị ahụ e ji ọlaedo kpụọ, ndị gbasapụrụ nku ha nʼelu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 19Devid kwuru sị, “E deela ihe niile gbasara osise ụlọnsọ ukwu a nʼakwụkwọ nke m sitere na ntụziaka Onyenwe anyị nweta. Onyenwe anyị nyekwara m nghọta banyere ihe niile metụtara osise ụlọnsọ ukwu a.” 20Devid gwakwara nwa ya Solomọn okwu sị, “Dị ike, nwee obi ike, rụọ ọrụ a. Atụla ụjọ, adakwala mba, nʼihi na Onyenwe anyị Chineke, bụ Chineke m, nọnyeere gị. Ọ gaghị ahapụ gị, maọbụ gbakụta gị azụ. Ọ ga-ahụ na ihe niile gaara gị nke ọma, tutu ruo mgbe ọrụ iwu ụlọnsọ Onyenwe anyị gwụsịrị. 21Ndị nchụaja ndị a niile, na ndị Livayị jikeere ịrụ ọrụ niile metụtara ụlọnsọ ukwu Chineke ahụ. Ndị ọzọ bụ ndị ọka ọrụ dị iche iche ndị o metụrụ nʼobi ga-abịakwa inyere gị aka, ma ndị ozi, ma ndị Izrel niile; ha ga-emezu iwu ọbụla i nyere ha.”
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.