Native Bible

1 Chronicles 28:12 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ.

1 Chronicles 28:12 in English

1 Chronicles 28:12 · Berean Standard Bible

The plans contained everything David had in mind * for the courts of the house of the LORD, for all the surrounding rooms, for the treasuries of the house of God and of the dedicated things,

Context

10Kpachapụ anya, nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla gị iwuru ya ụlọnsọ ya. Dị ike, rụọkwa ọrụ a e tinyere gị nʼaka.” 11Mgbe ahụ, Devid nyere Solomọn nwa ya ihe e sere gbasara otu ọ ga-esi wuo ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị ahụ, na nke ụlọ ndị ọzọ niile ga-adị nʼime ya, na nʼakụkụ ya; ụlọakụ ya niile, na ime ụlọ elu ya, na ime ụlọ ya, na ụlọ ebe ikpuchi mmehie. 12O nyekwara ya ihe osise gosiri ihe niile nke Mmụọ Nsọ tinyere ya nʼuche banyere ogige ụlọnsọ ukwuu Onyenwe anyị ahụ, na ọnụụlọ niile dị ya gburugburu, maka ụlọ nchịkọta akụ nke ụlọnsọ Chineke nakwa akụ niile nke e doro nsọ. 13Devid nyekwara Solomọn iwu otu ọ ga-esi kewaa ndị nchụaja na ndị Livayị, na iwu metụtara ọrụ ije ozi niile nke ụlọnsọ ukwu Onyenwe anyị, na iwu metụtara ngwongwo niile e ji eje ozi. 14Ọ wepụtara ọlaedo dị ukwuu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaedo a ga-eji jee ozi dị iche iche. Ọ wepụtakwara ọlaọcha dị ukwu maka iji ya kpụọ ngwongwo ọlaọcha a ga-eji jee ozi dị iche iche.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.