1 Ihe E Mere 27:1
1 Chronicles 27:1 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ (24,000).
1 Chronicles 27:1 in English
1 Chronicles 27:1 · Berean Standard Bible
This is the list of the Israelites—the heads of families, the commanders of thousands and of hundreds, and their officers who served the king in every matter concerning the divisions on rotating military duty each month throughout the year. There were 24,000 men in each division:
Context
1Nke a bụ usoro ndị Izrel, dịka ọnụọgụgụ ha si dị, ndịisi ezinaụlọ, na ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ puku ndị agha, ndị ọchịagha na-achị ọtụtụ narị ndị agha, na ndịisi ozi ha, bụ ndị na-ejere eze ozi nʼihe niile gbasara nkewa e kewara ndị agha dịka ịrụ ọrụ ha si dị nʼọnwa nʼọnwa nʼime ọnwa niile nke afọ. Nkewa ọbụla nwere ndị agha ọnụọgụgụ ha dị iri puku ndị agha abụọ na anọ (24,000). 2Ndị a bụ aha ọchịagha na-achị ndị agha nʼọnwa ọbụla. Onyeisi nkewa nke mbụ, maka ọnwa nke mbụ bụ Jashobeam nwa Zabdiel. Ọnụọgụgụ ndị agha dị na nkewa ya bụ iri puku abụọ na anọ (24,000). 3O si nʼikwu Perez nke dị nʼebo Juda, ọ bụ onyeisi ndịisi agha nke ọnwa mbụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.