Native Bible

1 Chronicles 22:7 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi* iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m,

1 Chronicles 22:7 in English

1 Chronicles 22:7 · Berean Standard Bible

“My son,” said David to Solomon, “it was in my heart to build a house for the Name of the LORD my God,

Context

5Mgbe ahụ, Devid kwuru, “Solomọn nwa m bụ nwantakịrị, onye na-amachabeghị ihe. Ma ụlọnsọ a ga-ewuru Onyenwe anyị ga-abụ ụlọ dị ukwuu, nke ga-enwe aha a ma ama, na nke mara ezi mma nʼanya mba niile dị nʼụwa. Nʼihi ya, aga m akpakọba ihe niile e ji ewu ya.” Ya mere, tupu Devid anwụọ, ọ kwakọtara ngwongwo riri nne. 6Ọ kpọrọ Solomọn, bụ nwa ya, nye ya iwu iwuru Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel ụlọ. 7Devid gwara Solomọn sị, “Nwa m, ọ dị m nʼobi* iwu ụlọ maka aha Onyenwe anyị bụ Chineke m, 8ma okwu Onyenwe anyị ndị a ruru m ntị sị m, ‘Ị wụsịala ọtụtụ ọbara, bukwaa ọtụtụ agha. Ị gaghị ewu ụlọ nye Aha m, nʼihi na ị wụsịala ọtụtụ ọbara nʼelu ala nʼihu m. 9Ma ị ga-amụta otu nwa nwoke onye ga-abụ mmadụ udo, na onye ga-enwe izuike nʼoge ya. Aga m enye ya izuike site nʼaka ndị iro ya nʼakụkụ niile. Aha ya ga-abụ Solomọn. Aga m enye Izrel udo na ahụ dị jụụ nʼoge ọchịchị ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.