1 Ihe E Mere 17:5
1 Chronicles 17:5 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ.
1 Chronicles 17:5 in English
1 Chronicles 17:5 · Berean Standard Bible
For I have not dwelt in a house from the day I brought Israel up out of Egypt * until this day, but I have moved from tent to tent and dwelling to dwelling.
Context
3Ma nʼabalị ahụ, okwu Chineke rutere Netan ntị, na-asị, 4“Gaa gwa ohu m Devid sị ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: Gị onwe gị agaghị ewuru m ụlọ ebe m ga-ebi, 5nʼihi na ebibeghị m nʼụlọ site nʼụbọchị m si nʼIjipt kpọpụta Izrel ruo taa. Kama e sitela m nʼotu ọmụma ụlọ ikwu baa na nke ọzọ, sitekwa nʼotu ebe obibi gaa ebe nke ọzọ. 6Nʼebe ọbụla m na-ejegharị nʼetiti ndị Izrel niile, ọ dị mgbe m sịrị onye ọbụla nʼime ndị ndu ha, ndị m nyere iwu ka ha zụọ ndị m, sị, “Gịnị mere unu ewubereghị m ụlọ sida?” ’ 7“Ma ugbu a, gwa Devid bụ ohu m, sị, ‘Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru: Mụ onwe m sitere nʼọhịa ebe ịta nri nke ụmụ anụ ụlọ, sikwa nʼebe ị na-azụ igwe ewu na atụrụ kpọpụta gị, mee gị onye na-achị ndị m Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.