1 Ihe E Mere 17:19
1 Chronicles 17:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu.
1 Chronicles 17:19 in English
1 Chronicles 17:19 · Berean Standard Bible
O LORD.* For the sake of Your servant and according to Your own heart, You have accomplished this great thing and revealed all Your greatness.
Context
17O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile. 18“Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma, 19O Onyenwe anyị, nʼihi okwu gị na dịka ọchịchọ obi gị si dị, i meela ihe a dị ukwuu, meekwa ka ọ mata nkwa ndị a niile dị ukwuu. 20“Onyenwe anyị, ọ dịghị onye dịka gị, ọ dịkwaghị Chineke ọzọ dị ma ọ bụghị gị, dịka anyị nụrụ ya na ntị anyị. 21Olee ndị dịka ndị gị, bụ Izrel, bụ otu mba nʼelu ụwa ndị Chineke ha gara ịgbapụtara onwe ya ka ọ bụrụ otu ndị, na iji mere onwe gị aha, rụọkwa ọrụ ịtụnanya dị egwu dịkwa ukwuu nʼihi ha, site nʼịchụpụ mba dị iche iche na chi niile ha site nʼihu ndị gị, bụ ndị ị gbapụtara site nʼIjipt?
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.