Native Bible

1 Chronicles 17:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a?

1 Chronicles 17:16 in English

1 Chronicles 17:16 · Berean Standard Bible

Then King David went in, sat before the LORD, and said, “Who am I, O LORD God, and what is my house, that You have brought me this far?

Context

14Aga m eme ka ọ chịa ụlọ m na nʼalaeze m ruo mgbe ebighị ebi. A ga-emekwa ka ocheeze ya bụrụ ihe guzosiri ike ruo mgbe ebighị ebi.’ ” 15Netan ziri Devid ozi dịka okwu niile nke ọhụ ahụ si dị. 16Mgbe ahụ, eze Devid banyere nọdụ ala nʼihu Onyenwe anyị, sị: “Onye ka m bụ, Onyenwe anyị Chineke, gịnịkwa ka ezinaụlọ m bụ, na ị mere ka m bịaruo nʼogogo ha otu a? 17O Chineke m, dịka a ga-asị na nke a bụ ihe dị nta nʼanya gị, ugbu a, i kwuola banyere ọdịnihu nke ụlọ ohu gị. Ma gị onwe gị Onyenwe anyị Chineke na-ele m anya dịka a ga-asị na m bụ onye ọnọdụ ya dị elu karịchasịa nke ụmụ mmadụ niile. 18“Gịnị ọzọ ka Devid ga-agwa gị, nʼihi nsọpụrụ i nyere ohu gị? Nʼihi na ị maara ohu gị nke ọma,

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.