Native Bible

1 Chronicles 15:28 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị.

1 Chronicles 15:28 in English

1 Chronicles 15:28 · Berean Standard Bible

So all Israel brought up the ark of the covenant of the LORD with shouting, with the sounding of rams’ horns and trumpets, and with cymbals and the music of harps and lyres.

Context

26Nʼihi na Chineke nyeere ndị Livayị na-ebu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị aka, ọ bụ oke ehi asaa na ebule asaa ka a chụrụ nʼaja. 27Ọ bụ ezi akwa ọcha ka e ji kee Devid ekike, dịka ndị Livayị niile bụ ndị bu igbe ọgbụgba ndụ ahụ, na ndị ọbụ abụ, na Kenaniya, bụ onyeisi otu ndị na-abụ abụ yi akwa ọcha nʼahụ ha. Devid yikwa uwe efọọd e ji akwa ọcha dụọ. 28Ya mere, ndị Izrel niile ji iti mkpu, na-ịfụ opi mpi ebule na-ịfụ opi ike, ịkpọ ụbọ akwara, ịkụ ogene na une, bulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị. 29Mgbe ha bu igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị na-abata nʼobodo Devid, Mikal nwa Sọl, lepụrụ anya site na oghereikuku ụlọ. Mgbe ọ hụrụ eze Devid ka ọ na-ayọrị egwu na-aṅụrị ọṅụ, o ledara ya anya nʼime obi ya.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.