1 Ihe E Mere 15:19
1 Chronicles 15:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz.
1 Chronicles 15:19 in English
1 Chronicles 15:19 · Berean Standard Bible
The musicians Heman, Asaph, and Ethan were to sound the bronze cymbals.
Context
17Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya, 18tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ. 19Heman, Asaf na Etan ka a họpụtara maka ịkụ ogene bronz. 20Zekaraya na Aziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Maaseia na Benaya bụ ndị na-akpọ ụbọ akwara dịka usoro abụ alamot, si dị 21Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm, Jeiel na Azazaya bụkwa ndị na-akpọ une dịka usoro abụ Sheminit si dị.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.