1 Ihe E Mere 15:16
1 Chronicles 15:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene.
1 Chronicles 15:16 in English
1 Chronicles 15:16 · Berean Standard Bible
David also told the leaders of the Levites to appoint their relatives as singers to lift up their voices with joy, accompanied by musical instruments—harps, lyres, and cymbals.
Context
14Ya mere, ndị nchụaja na ndị Livayị mezuru omenaala ido onwe ha nsọ maka ibulata igbe ọgbụgba ndụ Onyenwe anyị, Chineke Izrel ahụ. 15Ndị Livayị jiri osisi ogologo buru igbe Chineke ahụ nʼisi ubu aka ha dịka Mosis nyere nʼiwu nʼusoro dịka okwu Onyenwe anyị si dị. 16Devid nyekwara ndị ndu Livayị iwu sị ka ha họpụta site nʼetiti ụmụnna ha ndị abụ na ndị egwu, ndị ga-abụ abụ ọṅụ, nke ya na ngwa egwu ndị a ga-eso: ụbọ akwara, une na ogene. 17Ndị Livayị họpụtara Heman nwa Juel; ma site nʼetiti ụmụnna Juel ha họpụtara Asaf, nwa Berekaya. Sitekwa nʼetiti ụmụnna ha ndị Merari ha họpụtara Etan nwa Kushaya, 18tinyere ndị a, ha họpụtara ụmụnna ha ndị a, ndị na-esote ha nʼọkwa: Zekaraya, Jaaziel, Shemiramot, Jehiel, Unni, Eliab, Benaya, Maaseia, Matitaia, Elifelehu, Mikneya, Obed-Edọm na Jeiel bụ ndị na-eche ọnụ ụzọ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.