Native Bible

1 Chronicles 14:16 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza.

1 Chronicles 14:16 in English

1 Chronicles 14:16 · Berean Standard Bible

So David did as God had commanded him, and they struck down the army of the Philistines all the way from Gibeon to Gezer.

Context

14Nʼihi nke a, Devid jụrụ Chineke ase ọzọ. Chineke sịrị ya, “Esitekwala nʼihu buso ha agha, kama gbaa ha gburugburu, buso ha agha na ncherita ihu osisi balsam ndị ahụ. 15Ngwangwa ị nụrụ ụda ikiri ụkwụ nʼelu osisi balsam ndị ahụ, mgbe ahụ ka unu ga-apụ ibu agha, nʼihi na nke a pụtara na Chineke eburula unu ụzọ pụọ, itigbu ndị agha Filistia.” 16Devid mere dịka Chineke nyere ya nʼiwu. Ha tigburu ndị agha Filistia site na Gibiọn ruo Gaza. 17Ya mere, aha Devid bidoro na-ewu ewu; Onyenwe anyị tinyekwara ụjọ ya nʼobi mba niile.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.