1 Ihe E Mere 12:39
1 Chronicles 12:39 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri.
1 Chronicles 12:39 in English
1 Chronicles 12:39 · Berean Standard Bible
They spent three days there eating and drinking with David, for their relatives had provided for them.
Context
37Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ (120,000), ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta. 38Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta.
Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel. 39Mgbe ha pụkwutere Devid, ha so ya rie, ṅụọ, abalị atọ. Ọ bụkwa ihe ndị ezinaụlọ ha kwadoro ha ji bịa ka ha riri. 40Ndị Isaka, na Zebụlọn, na Naftalị si ebe dị anya bute nri. Ịnyịnya ibu, na ịnyịnya kamel, na ịnyịnya muul na ehi ka ha ji bute nri ndị a. Ọ bụkwa nri dị iche iche ka ha butere, dịka ụtụ ọka, na achịcha e ji mkpụrụ fiig mee, na achịcha ndị ọzọ dị iche, na mmanya, na mmanụ, na igwe ehi, na igwe atụrụ. Ha si otu a bute nri ndị a nʼihi na oke ọṅụ jupụtara nʼala Izrel niile.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.