1 Ihe E Mere 12:36
1 Chronicles 12:36 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ụmụ Asha dị iri puku anọ (40,000). Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya.
1 Chronicles 12:36 in English
1 Chronicles 12:36 · Berean Standard Bible
From Asher: 40,000 fit for service, prepared for battle.
Context
34Ọnụọgụgụ ndị ndu ụmụ Naftalị dị otu puku (1,000), tinyere ndị agha dị puku iri atọ na asaa (37,000), ndị ji ùbe na ọta. 35Ụmụ Dan dị iri puku abụọ na asatọ, na narị isii. (28,600) Ha bụkwa ndị agha jikeere ibu agha. 36Ụmụ Asha dị iri puku anọ (40,000). Ha bụ ndị ibu agha doro nnọọ anya. 37Sitekwa nʼọwụwa anyanwụ Jọdan, site nʼebo Ruben na Gad, na ọkara ebo Manase bi, ndị agha ọnụọgụgụ ha dị narị puku na iri abụọ (120,000), ndị ji ụdị ngwa agha ọbụla pụtara soro Devid. Ha bukwa ngwa agha ha pụta. 38Ndị a niile bụ ndị agha na-eje ozi nʼusoro ndị ji obi ha pụta.
Ha nwekwara mkpebi mgbe ha si ebe ọbụla ha si pụta ịbịa Hebrọn ime Devid eze. Ndị Izrel niile jikwa otu obi pụta ime Devid eze Izrel.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.