Native Bible

1 Chronicles 12:20 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020

Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase.

1 Chronicles 12:20 in English

1 Chronicles 12:20 · Berean Standard Bible

When David went to Ziklag, these men of Manasseh defected to him: Adnah, Jozabad, Jediael, Michael, Jozabad, Elihu, and Zillethai, chiefs of thousands in Manasseh.

Context

18Mgbe ahụ, Mmụọ Nsọ dakwasịrị Amasai, onyendu iri ndị ikom atọ ahụ, mee ka ọ gwa Devid okwu sị ya, “Anyị bụ ndị gị, Devid! Anyị so gị nʼazụ, gị nwa Jesi! Udo, udo ga-abụ nke gị, udo ga-abụkwa nke ndị na-enyere gị aka, nʼihi na Chineke gị na-enyere gị aka.” Ya mere, Devid nabatara ha mee ha ndịisi agha na-apụnara ndị mmadụ ihe. 19Ụfọdụ nʼime ndị ebo Manase gbasooro Devid, mgbe ọ gara sonyere ndị Filistia nʼịlụso Sọl ọgụ. Ma ya na ndị agha ya enyereghị ndị Filistia aka, nʼihi na mgbe ndị Filistia gbachara izu, ndị ndu ndị Filistia zilagara ya. Ha kwuru sị, “Isi anyị ka anyị ga-atụfu ma ọ bụrụ na Devid ahapụ anyị nʼọgbọ agha gbakwuru nna ya ukwu bụ Sọl.” 20Mgbe Devid gara Ziklag, ndị a bụ ndị ikom si nʼebo Manase ndị gbasooro ya: Adna, Jozabad, Jediael, Maikel, Jozabad, Elihu na Ziletai. Ndị a niile bụ ndịisi agha na-achị puku ndị agha nʼebo Manase. 21Ha nyeere Devid aka imegide ndị agha nkwata ahụ, nʼihi na ha niile bụ dike nʼagha, bụrụkwa ndịisi agha. 22Site nʼụbọchị ruo nʼụbọchị, ọtụtụ ndị ikom na-agbafeta soro Devid, tutu ruo mgbe ha ghọrọ igwe ndị agha, ndị agha nke Chineke.

Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.