1 Ihe E Mere 11:6
1 Chronicles 11:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha.
1 Chronicles 11:6 in English
1 Chronicles 11:6 · Berean Standard Bible
Now David had said, “Whoever is the first to strike down a Jebusite will become chief commander.” And Joab son of Zeruiah went up first, and he became the chief.
Context
4Devid na ndị Izrel zọọrọ ije garuo Jerusalem nke bụ Jebus. Ma ndị Jebus bi nʼebe ahụ, 5gwara Devid sị, “Ị gaghị abata nʼebe a.” Nʼagbanyeghị okwu ndị a, Devid dọtara ebe ahụ e wusiri ike nke Zayọn nʼagha, ya bụ obodo Devid. 6Devid ekwuolarị sị, “Onye ọbụla buru ụzọ buo agha megide ndị Jebus ga-abụ onyeisi ọchịagha ndị agha.” Joab nwa Zeruaya bụ onye mbụ gara, nʼihi ya, o nwetara ike ịbụ ọchịagha. 7Devid biiri nʼebe ahụ e wusiri ike. Ọ bụ nke a mere e ji akpọ ya obodo Devid. 8O wuru obodo gburugburu ya, site na Milo ruo na mgbidi gbara ya gburugburu. Ma Joab wuzikwara akụkụ obodo ahụ nke fọdụrụ.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.