1 Ihe E Mere 11:19
1 Chronicles 11:19 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
“Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya. Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara.
1 Chronicles 11:19 in English
1 Chronicles 11:19 · Berean Standard Bible
saying, “Far be it from me, my God, to do this! How can I drink the blood of these men who risked their lives?” Because they had brought it at the risk of their lives, David refused to drink it. Such were the exploits of the three mighty men.
Context
17Agụụ mmiri gụrụ Devid nke ukwuu, ọ sị, “Ọ ga-amasị m ma ọ bụrụ na o nwere onye ga-ekunye m mmiri ọṅụṅụ site nʼolulu mmiri dị nso nʼọnụ ụzọ ama Betlehem!” 18Ya mere, ha atọ wakpuru ọmụma ụlọ ikwu ndị Filistia, seta mmiri site nʼolulu mmiri ahụ dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama Betlehem, bulatara ya Devid. Ma Devid jụrụ ịṅụ ya, kama ọ wufuru ya nʼala dịka onyinye nye Onyenwe anyị, kwuo sị, 19“Chineke ekwela ka m mee nke a. M ga-aṅụ ọbara ndị ikom a, bụ ndị ji ndụ ha chụọ aja nʼihi ikute mmiri a?” Nʼihi na ha ji ndụ ha chụọ aja ịga kute ya, Devid ekweghị aṅụ ya.
Nke a bụ ụdị ike dike atọ ahụ kpara. 20Abishai, nwanne Joab bụ onyeisi ndị ikom atọ ahụ. O weliri ùbe ya megide narị ndị ikom atọ, tigbukwaa ha niile. Nʼihi nke a, ọ ghọrọ onye a ma ama dịka mmadụ atọ ndị a. 21Nʼetiti mmadụ atọ ahụ, a na-asọpụrụ ya karịa, ọ ghọrọ onyeisi ha. Ọ bụ ezie na-agụnyeghị ya dịka otu onye nʼime ha.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.