1 Ihe E Mere 10:6
1 Chronicles 10:6 · Biblica® Open Igbo Contemporary Bible 2020
Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ.
1 Chronicles 10:6 in English
1 Chronicles 10:6 · Berean Standard Bible
So Saul died together with his three sons and all his house.
Context
4Sọl gwara onye na-ebu ngwa agha ya, sị, “Mịpụta mma agha gị, were ya magbuo m ka ndị a a na-ebighị ugwu ghara ịbịa jiri m mee ihe egwuregwu.”
Ma onye na-ebu ngwa agha ya ekweghị, nʼihi ọnọdụ oke egwu. Nʼihi ya, Sọl were mma agha nke ya, dakwasị nʼelu ya. 5Mgbe onye na-ebu ihe agha Sọl hụrụ na ọ nwụọla, ya onwe ya dakwasịkwara nʼelu mma agha nke ya, nwụọkwa. 6Ya mere, Sọl na ụmụ ya ndị ikom atọ nwụrụ, ndị niile si nʼụlọ ya nwụkwara nʼotu mgbe ahụ. 7Mgbe ndị Izrel niile nọ na ndagwurugwu hụrụ na ndị agha agbaala ọsọ, na Sọl na ụmụ ya ndị ikom anwụọla, ha hapụrụ obodo ha niile gbapụ ọsọ. Ndị Filistia bịakwara bichie nʼime ha. 8Nʼechi ya, mgbe ndị Filistia bịara iyipụ ndị nwụrụ anwụ ihe ha ga-achịkọrọ, ha hụrụ ozu Sọl na nke ụmụ ya ndị ikom ka ha tọgbọ nʼugwu Gilboa.
Igbo text and audio: Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™, made available under an open license by Biblica, Inc.